Proverbs 6

Ịdọ aka na ntị banyere nzuzu

1Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe,
ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe,
2ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru,
onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.
3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị;
nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị:
Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya
enyekwala ya izuike ọbụla.
4Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ,
ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.
5Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta,
maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.

6Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ.
Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.
7Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha,
maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha,
8ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị
ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi.

9Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ?
Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie?
10Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,
nwa ịchịkọba aka nta zuo ike,
11ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,
ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.

12Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya,
onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ,
13onye ji iro na-egbu ikuanya ya,
jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu
na mkpịsịaka ya na-egosi ihe.
14Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ,
onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile.
15Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede;
nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya.

16Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị,
e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ.
17Anya dị nganga,
ire na-ekwu okwu ụgha,
aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ.
18Obi na-echepụta nzube ọjọọ;
ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe,
19onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri
na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.

Ịdọ aka na ntị banyere ịkwa iko

20Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,
ahapụkwala iwu nke nne gị. a
21Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,
ka ị ghara ichefu ha.
22Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị.
Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka.
23Nʼihi na iwu a bụ oriọna, b
Ihe ozizi a bụkwa ìhè,
otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba
bụ ụzọ ezi ndụ,
24idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,
sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ.

25Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,
ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị.

26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,
ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
27Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,
ma uwe ya ereghị ọkụ?
28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ
ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;
o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.

30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi
ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
31Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa.
Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
32Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,
nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
33A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya,
ihere ya agaghị ekwe ihichapụ.

34Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ;
ọ gakwaghị enwe obi ebere nʼebe ọ nọ nʼụbọchị ọ ga-abọ ọbọ.
35Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya.
O nwekwaghị ihe a ga-enye ya pụrụ ime ka iwe ya dajụọ.
Copyright information for IboBIU